17O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
18Sị, “Aga m enye gị ala Kenan ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”
19Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.
20Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
21O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị: