15Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi; bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
16Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara, na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
17O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
18Sị, “Aga m enye gị ala Kenan ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”
19Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.