13Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
14Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
15Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi; bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
16Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara, na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
17O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi: