1 Ihe E Mere 16

Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.

1 Chronicles 16:27 (UKJV) Glory and honour are in his presence; strength and gladness are in his place.

25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.

26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.

28Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

29E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.