23Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
24Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.