17Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
18Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn.
19Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
20Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
21Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.