19Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
20Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
21Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
22Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
23Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.