1 Ihe E Mere 20

Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe.

1 Chronicles 20:1 (UKJV) And it came to pass, that after the year was expired, at the time that kings go out to battle, Joab led forth the power of the army, and wasted the country of the children of Ammon, and came and besieged Rabbah. But David tarried at Jerusalem. And Joab stroke Rabbah, and destroyed it.

1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe.

2Devid kpupuru okpueze nke dị eze ha nʼisi, ahụtara nʼịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma, e kpunyere ya Devid nʼisi. O sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

3Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.