13Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
14“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
15Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche,
16ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
17Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ.