29Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
30Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
31Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
32Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.