27Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
28Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
29Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
30Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
31Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.