6Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
7Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288).
8Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.
9Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12). Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).
10Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).