28Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
29Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
30Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
31Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
32Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.