1 Ihe E Mere 27

Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.

1 Chronicles 27:32 (UKJV) Also Jonathan David's uncle was a counsellor, a wise man, and a scribe: and Jehiel the son of Hachmoni was with the king's sons:

30Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.

31Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.

32Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.

33Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.

34Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.