1 Ihe E Mere 28

Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.

1 Chronicles 28:14 (UKJV) He gave of gold by weight for things of gold, for all instruments of all manner of service; silver also for all instruments of silver by weight, for all instruments of every kind of service:

12O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ.

13Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi.

14Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.

15Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha.

16Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.