1 Ihe E Mere 28

Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”

1 Chronicles 28:19 (UKJV) All this, said David, the LORD made me understand in writing by his hand upon me, even all the works of this pattern.

17Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo.

18Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

19Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”

20Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.

21Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.