2Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya,
3ma Chineke sịrị m, ‘Ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị bụ onye na-ebu agha, onye wufuru ọbara site nʼigbu ọtụtụ mmadụ nʼagha.’
4“Ma otu ọ dị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel esitela nʼetiti ikwu m họpụta m, mee m eze Izrel ruo ebighị ebi. Ọ họọrọ ebo Juda dịka onyendu. Ọ bụkwa site nʼebo Juda ka o si họrọ ụlọ nna m, sitekwa nʼetiti ụmụnne m ndị ikom họrọ m. Mee m eze Izrel.
5Onyenwe anyị enyela m ọtụtụ ụmụ ndị ikom, ma site nʼime ha ọ họpụtara Solomọn nwa m ka ọ nọkwasị nʼocheeze nke alaeze Onyenwe anyị dịka eze Izrel.
6Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna.