6Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna.
7Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’
8“Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi.
9“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
10Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.”