1 Ihe E Mere 28

“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.

1 Chronicles 28:9 (UKJV) And you, Solomon my son, know you the God of your father, and serve him with a perfect heart and with a willing mind: for the LORD searches all hearts, and understands all the imaginations of the thoughts: if you seek him, he will be found of you; but if you forsake him, he will cast you off for ever.

7Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’

8“Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi.

9“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.

10Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.”

11Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.