9Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
10Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
11Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
12Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
13Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.