30Betuel, Homa, Ziklag,
31Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
32Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
33tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
34Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,