11Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
12Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
13Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
14Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
15Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.