1 Ihe E Mere 5

Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.

1 Chronicles 5:21 (UKJV) And they took away their cattle; of their camels fifty thousand, and of sheep two hundred and fifty thousand, and of asses two thousand, and of men an hundred thousand.

19Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.

20E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.

21Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.

22E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.

23Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.