1Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
2Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
3Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.