28Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
29Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
30Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
31Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
32Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.