1 Ndị Kọrint 1

Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.

1 Corinthians 1:15 (UKJV) Lest any should say that I had baptized in mine own name.

13Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?

14Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.

15Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.

16(Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.)

17Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.