1 Ndị Kọrint 1

Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?

1 Corinthians 1:13 (UKJV) Is Christ divided? was Paul crucified for you? or were all of you baptized in the name of Paul?

11Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.

12Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”

13Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?

14Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.

15Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.