17Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
18Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
19E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
20Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu?
21Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.