7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
10Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
11Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.