5Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya.
6Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu.
7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.