20Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.
21Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu.
22Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?
23Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka.
24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.