30Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?
31Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
32Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.
33Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.