1 Ndị Kọrint 10

Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.

1 Corinthians 10:5 (UKJV) But with many of them God was not well pleased: for they were overthrown in the wilderness.

3Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ.

4Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

5Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.

6Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha.

7Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.