1 Ndị Kọrint 10

Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

1 Corinthians 10:4 (UKJV) And did all drink the same spiritual drink: for they drank of that spiritual Rock that followed them: and that Rock was Christ.

2Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis.

3Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ.

4Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

5Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.

6Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.