1 Ndị Kọrint 10

Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha.

1 Corinthians 10:9 (UKJV) Neither let us tempt Christ, as some of them also tempted, and were destroyed of serpents.

7Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”

8Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.

9Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha.

10Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu.

11Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.