10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.
11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
12Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.
13Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke?
14Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo.