8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.
9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.
10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.
11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
12Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.