1 Ndị Kọrint 11

E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.

1 Corinthians 11:9 (UKJV) Neither was the man created for the woman; but the woman for the man.

7Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.

8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.

9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.

10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.

11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.