15Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi.
16Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a.
17Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma.
18Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
19Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara.