23Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
24Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
25Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
26Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
27Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị.