21Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.
22A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.
23Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
24Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
25Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”