26Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
27Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị.
28Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ.
29Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
30Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ.