1 Ndị Kọrint 11

Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe.

1 Corinthians 11:31 (UKJV) For if we would judge ourselves, we should not be judged.

29Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.

30Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ.

31Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe.

32Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.

33Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.