1 Ndị Kọrint 11

Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.

1 Corinthians 11:4 (UKJV) Every man praying or prophesying, having his head covered, dishonours his head.

2Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe.

3Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.

4Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.

5Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya.

6Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.