8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ.
9Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.
10Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.
11Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.
12Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa.