6Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
7Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile.
8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ.
9Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.
10Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.