4Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.
5E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi.
6Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
7Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile.
8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ.