13Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.
14Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ.
15Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ.
16Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ.
17Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla?