20Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ.
21Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
22Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa.
23E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha.
24Ma anyị adịghị esi otu a elekọta akụkụ ahụ ndị ahụ anya na-ahụ nʼụzọ pụrụ iche, nʼihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịrị nta bụrụ nke anyị kwesiri inye nsọpụrụ karịa.