18Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ.
19A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị?
20Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ.
21Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
22Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa.